Psalms 48

Otu Abụ. Abụ Ọma nke ụmụ Kora.

Abụ nke Zayọn

1 Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto,
nʼime obodo Chineke anyị, nʼugwu nsọ ya.

2Ọ mara mma nʼịdị elu ya,
bụkwa ọṅụ elu ụwa niile.
Ugwu Zayọn, obodo eze ahụ dị ukwuu,
dịka ebe kachasị elu nke Zafọn.
3Chineke nọ nʼime ebe ya e wusiri ike;
o gosila onwe ya dịka ebe mgbaba ha e wusiri ike.

4Mgbe ndị eze jikọtara ndị agha ha ọnụ,
mgbe ha bịakọtara nso,
5ihe ha hụrụ juru ha anya;
nʼihi oke egwu, ha gbara ọsọ.
6Ahụ ọma jijiji bidoro ha nʼebe ahụ,
ihe mgbu ha dịka nke nwanyị na-achọ ịmụ nwa.
7Ị lara ha nʼiyi dịka oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ
si ala ụgbọ mmiri ukwuu nke Tashish nʼiyi.

8Dịka anyị nụrụ,
otu a ka anyị hụrụ,
nʼime obodo Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
nʼime obodo Chineke anyị:
Chineke na-eme ka o guzosie ike
ruo mgbe ebighị ebi. Sela

9O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị,
ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ.
10O Chineke, dịka aha gị,
otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile;
aka nri gị jupụtara nʼezi omume.
11Ugwu Zayọn na-aṅụrị ọṅụ,
obodo nta niile nke Juda nwere obi ụtọ
nʼihi ikpe gị niile.

12Gaanụ Zayọn gburugburu, Jegharịa ya gburugburu,
gụọkwanụ ụlọ elu ya niile ọnụ.
13Lezienụ mgbidi ya niile anya,
nyochakwaanụ ebe ya niile e wusiri ike,
ka unu nwee ike ịkọrọ
ọgbọ na-abịa nʼihu akụkọ ndị a.

14Nʼihi na Chineke a, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi,
ọ ga-abụ onyendu anyị, ọ bụladị ruo nʼọgwụgwụ.
Copyright information for IboBIU